Judges 21

Ndị nwunye ndị ikom Benjamin

1Mgbe ndị ikom Izrel niile zukọtara na Mizpa, ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo Benjamin lụọ ụmụ anyị ndị inyom.”

2Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda. 3“Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?”

4Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.

5Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.

6Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya. 7Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?” 8Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa. 9Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa.

10Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị. 11Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.” 12Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha.

13Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo. 14Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.

15Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu. 16Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala? 17Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ. 18Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’ 19Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”

20Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ, 21ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu. 22Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ”

23Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya.

24Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya.

25Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.

Copyright information for IboBIU